Igbo bu Igbo na-ege nti, ekelee m unu. Nke a bu akuko ugha RWB nke si na
Mahadum Uwandigbo ekpu unu nti. Onye unu na-anu olu ya bu ochie dike
Omenka Ejike Eze. Na mbido, ndi a bu isi sekpu nti n'akuko unu ga-anu.
Otu a na-akpo Mmanya Ado n'Udu, maobo MANU n'aha mkpirisi, bu otu jikoro
ndi na-eti nkwu n'Onicha, edeele akwukwo depuru onyeisiala mba Kenan nke
di n'akwukwo nso ka o buputa mmanya foduru mgbe Jeso Kristi mere mmiri
ma o ghoo mmanya.
Umuagbogho mba Umuekwensu akpoola oku ka ndi muru ha mee ngwngwa gbanwee
aha mba ahu maka na o na-agho ya ahia.
Ugba na okporoko achiputala nwoke Owere siri Panya lota ukwu n'ama.
Umuibe, o kwa a si na okenye jiri oji n'aka kwaa ukwara, umummuo egewe
nti. Tozia nu nti n'ala nuru oria danda.
"Mgbe Jeso Kristi nwa Chineke mere mmiri ka o ghoro mmanya, o bughi
naani ndi Kenan ka o bu n'obi ruo oru oma a, kama o bu ka nkwu buru ewu
na okuko n*uwa n'elu uwa". Nke a bu okwu onyeisioche otu kporo onwe ha
Mmanya Ado n'Udu maobu MANU n'aha mkpirisi. Maazi a siri na o bu ihe
mwute na ndi Kenan n*uchara mmanya dachie uzo mgbe Jeso mere ihe ebube
a, mana ha bu ndi Kenan achoghi ka umu uwa soro ha kporie ndu, ka a
ga-asi na o bu naani ha ka Chineke ziteere okpara ya n'uwa. O wee kwuo
na o na-adi mma ka Fada riwe ya cheta Broda maka na akpiri adighi eje
nwanne ya nkiri.
Umuagbogho mba Umuekwensu akpoola oku ka ndi onu na-eru n'okwu na mba
ahu gbanwee aha ya bu obodo n'atufughi oge. Umuagbogho a siri na aha
obodo ahu emeele ka umuokorobia mba ndi ozo ghara ina-aju ma ha kpowara
akpowa ka ha na-ere ere. Onu na-ekwuru umuagbogho a siri na ihe mere ha
jiri choo igbanwe aha ahu ozugbo bu na nwata gafee "onye muru?", o ruo
"onye na-alu?". Nwa a, nke rioro ka a ghara ikpo ya aha, siri na ogbo ha
ndi Mbaoma, nke na-azabu Umuudele, na-agazi ahia ka akara oku kemgbe mba
ahu gbanwechere aha ha.
Mgbe ndintaakuko anyi jere kpoturu ya, eze na-achi Umuekwensu bu Igwe
Okpeazuemenjo siri na ihe umuagbogho ahu na-ekwu bu ihe dabara adaba
maka na ndi Igbo ka kwenyere na mmadu na-eme ka aha ya di. O wee kwuo na
ya na ndi ichie ya ga-etinye anya na mmiri gbasara ya bu okwu tupu
umuagbogho ala ya aghochaa "nna ga-alu".
Otu nwoke Owere si Panya lota n'izu gara aga emeele onwe ya pobuliki
asolutu n'okporo korota mgbe o jere n'ulooriri wee tachaa ugba na
okporoko n'ejighi ego o ga-eji kwuo ugwo. Onye nwe ulooriri ahu bu
Odoziaku Manmuswak siri na ya chere ya nwoke ahu kpa shisii ebe o siri
ala Bekee lota. O kwuru na ugba na okporoko nwoke ahu tara putara ihe
kariri otu pam. O mere ka amata na nwoke ahu malitere ghachawa anya ka
onye zuru ohi ji mgbe a siri ya kwuo ugwo ugba o tara. O bu mgbe ahu ka
Odoziaku Manmuswak jiri jide nwoke mmadu nyipuchaa ya uwe dum o nyi
n'ahu wee chupu ya n'ezi. Mgbe a juru nwoke ahu ihe tinyere ya n'udiri
omume a nke na o na-akuzi mgbirigba agaghari, naani ihe o sara bu: "m
takwaa ugba n*uo mmii, ndi uloelu ha wurume".
Umuibe, a si na onye riwe anu ka o si ato, o righi anu udele o rie nke
mmadu. N'ihi ya, anyi ga-apiachi akuko anyi nke taa ma unu nuruchaa okwu
ndi anyi jiri mere isi akuko.
Ndi oti nkwu n'Onicha amalitele busowe ndi mba Kenan agha maka naani ha
in*ucha mmanya Jeso Kristi kwadoweere uwa niile.
Umuagbogho Umuekwensu egosile mwute ha n'etu aha obodo ha si ekponyere
ha aja na gari.
Onye tara ugba n*uo mmii, ya jidekwe ego o ji akwu ugwo maka na onye
riri akwa okuko maara na ashi na ukwu okuko di na ya.
Ka Olisa chebe unu.
© Omenka, 1998