Akwa.
Nwata bere akwa.
Nwata kwara akwa mgbe agụ na agụ ya.
Nwata yiri akwa mgbe oyi na atụ ya.
Nne nwata ahụ sara akwa nwata ruru unyi.
Nne nwata nybere nwa ya n’akwa ka O hie ụra.
Akwa na atọ ụmụ aka ụtọ iri.
Nwata na eri akwa na akwa kwa ụkwara.
Ibe akwa anaghị egbu nwata,HO! HA!
Hapụ nwata nae be akwa ka O bewe; akwa anaghị egbu nwata, O besị ike gwụ ya O zue ike.
Oke ọkpa ọkụkọ nakwa ebe akwa : ọkịkọrọrọkọọọọọọọọọọ!
Nnekwu ọkụkọ anaghị ebe akwa, ma Ọ na eyi akwa, kpukwa akwa ahụ rue mgbe ọzụrụ.
Ntị ọdị kwa?
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṇụsiobi Madụ.