Ị jesịa eje ọfọ gị ọlịla.
Ụwa bụ ahịa, onye zụsịa Ọ laba be Chi y ana ọnwụ.
Igwe nile ga agarịrị n’ọkụ, gbam!
Agbataghị ya na ọsọ.
Akataghị ya na anya.
Ego apụghị ịzụta ya.
Ije ụwa dị egwu.
Ije nile nwere ihu/iru na azụ.
Agakata n’iru, alaba azụ.
Agakata na ụzọ, ababa ọhịa.
Anọkata ọdachị okporo ụzọ adakwasị ndị na aga ije/njemụ.
Chetakwa ije Odumodu jere.
Chetekwa ije Omenụkọ jere.
Chete kwa ije mụ na gị na eje na ụbọchị tata.
Ije ego; nwoke na eje ije ego, nwanyị na eje ije ego.
Ụzọ mmiri abụghị ụzọ nkụ.
Enyi oooooo; enyi alala!
Enyi ooooooooooooo ,enyi oooooooooooo; enyi!
Ụwa na agba ghata ghata.
Ụwa chịgha chịghị eeeeeeeeeeeee!
Ụwa chịgha achịgha le eeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Eji ike eme ụwa.
Chineke anyị nọ kwa Gị n’aka oooooooo,
Ndị nọ Gị n’ọkpa akarịala ooooooo!
Ọgụ adala, onye ọbụla zọba isi onwe ya.
Nigeria chịgha achịgha leeeeeeeeeeeeeeee!
Ntị ọdị kwa?
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṇụsịobi Madụ.