Bunye ya oche!
Panye ya oche ka Ọ nọdụ ọdụ/ala.
Onye bịara nan ga Awọ sị Awọ bunye ya oche, Ọ hụrụ nke Awọ nọ?
Ahụ Dimkpa ahụ ogwuodogwo imi ya.
Ihu Dike na anyụ nma nkọ.
Onye amaghị mmadụ na akpọ ya tata-nwoke.
Ejighi akwa eyi n’ahụ ama Odogwu.
Ihe Akpị na eme dị ya n’ọdụdụ.
Ebube Agụ na eche Agụ.
O ji ọnụ aba Ọjị abụghị Dike.
Dike na eme nke ahụrụ anya kwe!
Ntị ọdị kwa?
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṅụsịobi Madụ.