Ọjị Ọgbụgba-Ndụ
nke afọ January 1st 2017.
Maazị Nnanta
Chidị Ụwadịneke na Maazị MOE Ene( Egbedaaovulu).
Afọ ọma
rukwa mụ na gị na ụmụ Igbo nile aka ooo,HO! HA!
Ise
eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee.
Onye wetara Ọjị
wetara ndụ.
Ka anyị nile
ta ya bụ Ọjị ka anyị were tata ndụ.
Ise
eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Igwe ka ala
bịa ta Ọjị ooo.
Eke bịa ta Ọjị
ooo.
Orie bịa ta Ọjị
oooo.
Afọ bịa ta Ọjị
ooo.
Nkwọ bịa ta Ọjị
ooo.
Ndụ mmir ndụ
Azụ.
Ise
eeeeeeeeeeeeeeee!
Ndụ Nwoke
,ndụ Nwanyị.
Ise
eeeeeeeee.
Egbe bere
Ugo bere nke sị na ibe ya ama ebe nku kwa ya na ike eeee.
Ise
eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee.
Ka ngozi , ịhụnanya,udo,
na ahụ isi ike bụrụ oke anyị nile na afọ ọhụa 2017!
Ise
eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Cha cha cha
Igbo kwenu!
YAA!
Cha cha
Biafra kwenu!
YAA!
Cha cha cha
Obodo Afrika nile kwezuenu!
YAAA!
Ya dịrị anyị
nile na mma.
Ndị nile nọ
na ụzọ ije chetanụ na Ndị Nna nnaanyị ha tụrụ ilu sị: Ọ bịara be onye abịagbula
ya ka Ọ ga abụ Ọ law aka mkpukpu ghara ịpụ ya n’azụ.
Ghọtakwa nụ
na ojemba enwe iro.
Ụmụ Igbo bụ
Ojemba rukwa echi.
Were nụ obi ọma
tinyere ụwa, maka na ejighị ike eso elu ụwa,HO! HA!
Ahụghị ka
emere, eme ka afụrụ.
Ụwa dị egwu.
Ma ka osina dị,
ka anyị ghara ịgbalarị Chi anyị na ọsọ.
Ndidi ka eji
eso ụwa.
Onye nọ n’obodo
onye ọzọ, ihe ga na eme ya ụbọchị nile iji na echetara ya na Ọ bụ ọbịa n’obodo
ahụ.
Ka anyị gwa
nụ onwe anyị Eziokwu maka na Eziokwu bụ ndụ,HO! HA!
Igbo/Biafra
ga adị ooooooooo!
Ise
eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne
Abrahamụọgụ Aṅụsịobi Madụ.
Ụra dị mkpa
oooooo,HO! HA!
Ụra bụ ọgwụ
ka ọgwụ,HO! HA!
Onye rahụrụ ụra
abalị ọfụma, ka onye bara ụba na enweghị ike ịrahụ ụra.
Ọ dị ndị
anaghị arahụ ụra ma ha aṅụghị ọgwụ.
Ndịa nwere
oke nsogbu,HO! HA!
Ị me mmadụ
ibe gị ihe ọjọ, Ị gaghị enwe ike hie ụra ọfụma ọfụma, maka na obi gị agaghị ezu
ike.
Obi gị amaghị
gị ikpe maka ihe ọjọ Ị mere mmadụ ibe gị, ọ ga arahụ ụra nke na ajụ ahụ oyi.
Nwata na
agha Nne ya na Nna ya ahụ ka ha ghara ịrahụ ụra, gakwa agba onwe ya ụra,HO! HA!
Ma onye ukwu
oooooo, ma onye nta oooooo, ga aghọ ndị ọlụ nche abalị,HO! HA!
Ejighị ike
arahụ ụra.
Mgbe ụra na
abịa aburu mmadụ, gị onwe gị anaghị ama, Nwanyị gị anaghị ama.
Ụra dị ka ọnwụ;
kama ihe dị iche bụ na Ị ka na eku ụme ndụ.
Maka na onye
nwụrụ anwụ anaghịzịkwa eku ume,HO! HA!
Wụọ mụ ihe
nile, ma awụọla mụ ụra,cha cha!
Ụra ka ego
,HO! HA!
Onye arahụghị
ụra abalị abụa na atọ, ara agba ya.
Ụra bụ ọgwụ
ka ọgwụ na eme ka ahụ gị sie ike, mekwa ka ahụ dị gị gara gara mgbe chi foro
iji ga enwe ike ịlụ ọlụ na ụbọchị ahụ.
Jisien nụ
ike na eme ihe ga enyere ahụ gị aka ka ohie ụra ọfụma ọfụma.
Ndụ na alụ ọlụ
abalị ga achọrịrị ụzọ hie ụra n’ehihie, ọbụghị otua ahụ, nsogbu ga adị.
Ha ga ada ọrịa.
Ezigbo akwa
siri ike dị mma idina ka ụra were tụa gị.
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne
Abrahamụọgụ Aṅụsịobi Madụ.
Ndi Igbo
na Ndi Enyi Anyi,
Oburu na ina agu ihe a oputara na
inoruela Afo Puku Abuo, Iri na Asaa (2017). Obara uru ka Ndi di NDU KELE
CHUKWU UMU IGBO MERE KA ANYI DI NDU RUE AFO OHURU A obughi nihi na anyi kariri
ndu nwuru anwu nma mana obu ka Chukwu si choo . Otutu ihe anyi na
enweghi ike GBOCHIE emela. Ufodu anwuola nime afo garaga. Odighi ihe
dika AFO GBARA AKA LAA. Ufodu na adoga ihu na ha na ezi na ulo
ha ga adi ndu rue na-afo ozo. Chukwu Anyi ga anara EKPERE ONYE
OBULA . Onye deputara 'OGBUGBA NDUA' bu Dokita
Ogochukwu Ene na Afo, Puku, Nari Itolu, Iri Itolu na Asaa(1997). Oge ikpe azu
m'ziputara ozi a bu na Afo Abuo gara aga, 2014. Ihe niile edere ebe a
nadigide rue taa. Obu
nezie
na Ufodu Ndi akpoturu n'oge ahu anwuola. Chukwu Anyi anakwerela MKPURU
OBI HA N'UDO. Inwe kwara ike TINYE NKE GI. Ozi a rute gi, BIKO
WEKWARA OJI IGBO TAA nihi na inoruela Afo OHUU ooooooo.
Nnanta
Chidi. Uwadineke
Onye ihe
oma gbasara Ndi Igbo, Ogan'ru na Asusu Anyi na anu oku n'obi.
Klinton-Kontri,
Akinso U.S.A.
Ndi Igbo
na Ndi Enyi Anyi,
Unu
aboola chi eee?. Unu anoruela afo ohuu, Puku Abuo, Iri
na Ano (2014)?. Ka anyi nyenu Chukwu Abiama(Chukwu Obi
Oma) ekele puru iche.!!! Onye deputara Ogbugba ndu oji a
n'abali Mbu n'Onwa Mbu n'afo 1998 (1/1/98) bu Dokita Ogochukwu
Ene bi na New Jersey n'oge ahu. Amaghim ma oka bikwa ebe ahu. Odi nma ka onye
obula nwe ike guo ya, onwere ike oburu na okpoturu gi. Emere m ka odi
nfe imata ndi Dokita Ene kpoturu siite na ihylyte(highlight) aha ha. Oge
odere ihe a, enweghi Igbo_forum ma obu ndi ozo. Ihe enwere mgbe ahu bu: mailto:igbo...@mcfeeley.cc.utex.edu.
Amaghi m ma oka dikwa. Inwee ndidi gudarue ihe a ala, i ga ahu na
onyere Ndi Igbo niile, Ndi Nwoke, Nwanyi, Umuaka, obula di ndi IRO Ndi Igbo
EZIGBO NDUMODU. Echere m na Ndi okpoturu oge ahu bu Ndi no na
agba mbo Iwelite Asusu na Omenala Igbo ebe ha bi. N'ogwugwu, m'ga-akpoturu
Ndi m'gecheta na agba mbo ugbua. Matakwa, ihe a bu okwu Dokita Ene site
n'asusu Igbo ya. Odere si:
"NDI
IGBO:
Kwenu
Kwenu m!!
Kwezuenu
m!!!
Ekene m
unu niile, kenekwe ihe na-emelu unu ihe. Afo ofuu oma! Oji abia! Ka anyi gbaanu
ndu oji. [kolanut communion] Omenka Ejike, mgwa gosi umunna oji. Ogbagwojuru gi
anya?. Mgwa soro akala anya nke m ga-enye gi paa oji. [controversies de!:))]
O-o ya-o, a si na oji Eze di Eze n'aka? Daalunu. Aga m asu Igbo dika Omenka
kuziri na Mahadum Uwandigbo. [All mistakes are mine; those not mentioned simply
did not click as I shot you know-how!. I pre-apologize. Obialor Obiekwe can
provide a decent Christian version: this one is "pop-Odinani" :
[pseudo traditional Igbo creed]. Na mbu: ka anyi kelee ala Amerika, maka na ama
erike n'obodo a. [Deities of this land, please permit us to pray in our
language; I am sure you all understand. Thanks immensely]. Biko onye
Cherokee ma obu onye mba ozo ndi nwe ala a, weree oji akpa: maka oji luo
ulo....
Ndi
Enugwu, unu sokwe. Ndi Ebonyi, oji abia. Umunna m n'Anambara, unu nokwa?.
Ndi Ika, oshimiri Naija egbochine unu; leenu oji. Ndi ogo m, n'Imo, nkele wu
ya-o! Oji Igbo! Ndi Abia, enyimba bu enyi Igbo! Ndi Ikwere, ma ndi bi na Diobu
ma ndi bi na Ogbuo na Abali, oji abianu. Opobo, Ubani, ndi no na Akwa Ibom
n'akwa Ogoja, unu sokwe. Ndi bi n'Ugwu Awusa, tulukwenu ugo. Ndi bi
n'Odidanyanwu, "kosi wahala"---unu sokwe.
Anyi bu
ndi bi n'Igbo Uzo[Igbo Diaspora] ekene m unu niile. Ifeanyi nwa Anyanwu na
Japan, i ga-ebi. Afo ofuu i huru, anyiahula ya n'Amerika. Okaa Ufo Uzodike,
Mandela na umunna anyi, ahu adikwa ha?. Maazi Uzo Okafor na Namibia, keleee
Onyeishiala Sam Nujoma. Chuks Oguibe na London, i nokwa? Kelee ndi Bekee
niile na-echere ndi Igbo uche oma. Maazi "Chill-ed"-- zekwere ndi
awalaawala. Ndi Finland, ukpa ekene. Maazi Basil Ene, fulifulimmiri
["snow"] a na-adakwa? Ndi Russia, ndi Holland, ndi Germany, n'akwa ndi
no na Obodo Oyibo, otito diri Chukwu.
Ndi
Kanada, abia m. John Nwoke, ndi New Foundland ha na awa anya? biko hapu ihe
edere n'ugboala bata n'ime. Fada Munachi, i ga-adi ndu wee kpuru okpu
mme-mme na Vatican. anyi ga-enwe pope bu Onye Igbo. Uche gi odikwa ya! Omenka, i nokwa?
O"u m gaba na egwu adighi? Dike m ji eje mba, ekene diri gi. Chuks nwa
Ezeun, Vancouver o ka dikwa na British Columbia? Hmmm! O dikwa
"risky"!. Bosa, Ugo Nwokeji, o lee unu? Enyi m gbogboo, Tochai
Omenuko, i kpakwa ahu? O nwere ihe anyi mere gi?. Biko puta n'ama ka anyi hu
ogologo imi gi. Iyi na Mass. " and of the massess", abia m: o nwere
onye na-acho gi uka? Si ya na MOE nokwa, na umu Biafra anaghi arahu ura. Enyi m
gboo-gboo Maazi Nwuke, udo dikwara gi na Massachussets. Ndi Nu Yoku, NY,
mmammanu. Onyeozizi Echeruo, i ga-adi. Ihe i na-emere ndi Igbo dikwa
"imilimioso. " Ichie Cyber n'onwe ya, Okaa Obiora Taiwan
Ozochiawaeze, o'u gini na-ese? Ndi "Ogbako Mba Uwa"[UNO] ha
na-emekwere gi ihe oma? Chiji nwa Akoma, na-asupuru m Bekee. Nu Jesi, NJ
kwekwenu! Anaeze Enigwe, ekenekwe m gi, kenekwe ibve na -emere gi ibve.
Nnewi 1, Okaa nwa Nwosu, i nokwa n'ala a? Okaa Ukobasi nwa Orji, o'u m patalu
gi Schnapps? Zeribe, o'u ujo? N'uwa nke a! Okaa Kalu Njoku na Yale, ishiewu
o dikwa ebe ahu? Ukpa na okporoko anaghi aso m aso. Ndi Baltimore/DC/ Virginia,
rienu!. Okaadibia Alex nwa Ukoh: onye oma m ji-eje ogu: biko kwuru m n'azu,
buoro m uzo. Weree mma i ji-awa afo yie ha egwu:). Ogbuefwi nwa Odunukwe na
Nnewi, i sokwa anyi? aka m dikwa ocha-o! Osineme: biko hapu ofee ndi ogo anyi
bia ka anyi taa oji. Bennet nwa Akpa, meghere m uzo n'ulo gi ohuu. Manny
nwa Aniebonam n'Abagana, onye m ji eme onu: a na-eme eme....bia ka anyi mee
n'oji. Kpotukwara ndi agbataobi gi maka na otu awughi n'ezihi!...i ma onye m
na-ekwu maka ya :) Afam Agwu, ndii?. Eshi o dukwa? Laur Onyekwere n'Enugu, i
ga-adi. Chris nwa Chukwu, birikwe o! Ka m kpotulu Onyeozizi Okaa Olu
Oguibe [OOOO] na Florida tupu m gawa Texas. Biko egbozine oge; puta ka anyi tuo
gi aha. Texas: O'U GINI? Mag nwa Ekwueme, iyi egbunekwe gi. I ga-adi; gi na ndi
be gi na ndi be anyi niile. Gregg nwa Ukaegbu, socrates n'ama Igbo, i
na-ekpolikwe ndu? Taba ife alu, ma agwachakwa "you know who,"
Ndi Mehico waa anya, kpotulu m n'egbughi oge ka anyi mee ha "many
things." KDK na Austin Texas, i nokwa n'ala a? I ji ogwu?
Ndi Obodo
William Clinton, o'u gini? Maazi Uwadineke, i sokwe? Maazi Ndubuisi Okere, bia
tinye aka n'oji a. Kentucky abia m: Okpa Asoghi
Apiti, Okaa
Akuma nwa Njoku: ekene m gi. Ama erike, ma ana m anu ihe i na-ekwu. Iowa,
unu ka na-akokwa oka na Sioux City?. Okaa Enekwechi, mmamma o!. Jidekwe ka iji.
Maazi Ayika na Umunne na Minnesota, ekenekwe m unu niile. Maazi Uzoma Chukwu,
ndeewo enyi m. Maazi Uzo Onyemechi, nakwa echeki: ana m anu olu gi. Daalu-o!.
Ndi obodo Lincoln, abia m: Okaa Kanayo Akujieze, tulukwe ugo. I ji ofo, o ji
ofo ga-ala. Nwoke m Emeka Onumonu, biko na-abulu m abu bu sooso mma. I ga-adi.
Ndi California, unu ana anya anwu ka ndi Pitakwa? Ugo Anakwenze, biko si ndi be
anyi na-egwu adighi, na ako bu ije. Okaa Uzo Okoroanyanwu, o na-dabakwa
"out there"? Onye a na-etu aha nwere ihe o na-eme. Ndi nwe gi
nwere mmadu. A na-eme eme, a na-ekwu ekwu. I meele, Ndi Igbo ga na ekwu
maka gi luo mgbe ebighebi. Onye si na o di "very easy," ya mee ka
anyi kwuo!. Bikonu ka m kpotulu ndi enyi anyi: nwaanyioma Nkiru, biko
bulu ukpa okoko "rose"[@>>>>>>--------Make a dozen
pink, if you must!] JS, you are in the house. Snow, take a little bit of it
across the River Niger, if you make it. If not, 1998 is another year. Ndi ilo
anyi, udo diri unu ----for obvious reasons: ka unu haa anyi aka. Ndi
osochiegbu, ndi m na-akpo "ndi ibo," anyi bu Ndi Igbo si unu chetekwe
na ka eriri n'onu bu ka anyuru n'ike. Werenu ututu chowa ewu oji. "Why you
lose your soul, you have really lost it." Ohere ka dikwara gi icheghari
wee soro kpawa alo maka odinma ndi Igbo niile. Udo na ihunanya ka m ji bia; udo
ka m ga-eji laa. Onye lua, ya rie; onye rie, ya n*uria. Ndi ibe anyi, ndu
mmiri: ndu azu: odinala anyi: odinihu anyi: OGBUGBANDU OJI; omenala Igbo.
OMENALA IGBO GA-ADI RUE MGBE EBIGHEBI!!!! . A mutala anyi n'uwa ka anyi mutakwa
ndi ozo. Okorobia ndi na alubeghi nwunye, Chukwu biko nye ha umuada bu sooso
ezi mma na ezi omume ha ga-alu. Ndi lutagoro nwunye, Chukwu biko nye ha nwa nke
ahu, ishi na uche zulu oke. Onye muta, ya biko zua: anyi zuchaa umuaka anyi, ha
azua anyi. Asi na ego amaka? Eyee, ego di nma inwe. Mana e jighi ike achu ego.
Ihe anyi cholu bia na obodo Amerika abughikwa oluoo, olu di n'ala Igbo:
ego na ihe e ji enyere ndu aka ka anyi na-acho n'ala a. Onye chota ya were ego
ahu meputa ezi ihe n'ebe o bi o niihi na ebe onye bi ka o na-awachi. Nyerenu
umunne na umunna anyi aka; dozienu onwe unu nakwa ezi na ulo unu, maka na ezi
na ulo ka Igbo ji biri. Onye mmadu nyeere aka, ya nyekwara ndi ozo aka.
Onye achokwala okwu. Nwa madu egbule nwa mmuo ma nwa mmuo egbune nwa mmadu.
Nyerenu ndi inyom anyi aka ka ha na-azuputa umu anyi. Zekweelunu nso Ani. Ishi
kotelu evu: evu gbaa ya. O kwa ile oma ka eju ji-aga niogwu, mana onye taa anyi
aru niikeoma o zeghi nshi, anyi taa ya aru niishi anyi agaghi ezelu uvulu.
Umuaka anyi ga-ege anyi nti.Anyi ga-ebi dika obodo si kwado. Umunna m, anyi
na-elekwe anya ka-esi akpa nkata ndorondolo na obodo Naijiria. Ka anyi
hapunu o tulu nnu ma o tulu ose bulu uzo tinye ogiri n'ofe ka o wee too
uto. Anyi racha ofe ahu, n*uo mmanya, anyi ewere gbaa izu, izu umunna. O teele
aka ndi Igbo ji-acho ka ha na ndi agbataobi anyi nwee nghota toluato. Anyi
agaghi ekwe ka ndi mkpasa na ndi nlafu duba anyi niime onwunwa. Onye ji ofo
ga-ala: anyi ji ofo. O nweghi ihe anyi mere megide mmadu. Otutu
okwu adighi mma na uka mgbede, ma agwachakwaa ndi uka Katoliki . Anyi
ga-ebi nu. Afo nke a bu 2011 ga-ami mkpuru ga-abara anyi uru. Ka anyi were
ihe gbasara odinma anyi tinye niaka Chineke. Chukwu Abiama, ka O dube ndi niile
na-agba mbo MAKA OGANIRU NDI IGBO. Ndi Ichie, biko bianu taa oji. Mmuo ndi anyi
ma, na ndi anyi amaghi, mmuo niile na-emere anyi ihe oma, bianu taa oji. Alusi
na mmuo niile di na Enugwu na Ebonyi: bianu taa oji. Alusi Anambara n'akwa mmuo
ha niile: bianu taa oji. Nke ndi Imo na ndi Abia, na mpaghara Mba Mmiri bu
be ndi Igbo, bikonu oji abiala-oo!. Alusi na mmuo ndi Mmu Ika,
biko, Oshimiri Naija egbochikwene unu: gbatanu bia soro anyi mee mmemme
oji a, soro anyi rie oriri oji a nke anyi ga-esi na ya rita ndu. Unu zuko,
bikonu chebenu umu Igbo niile na ndi enyi ha bi n'uwa nke a anyi bi niime ya;
duzienu anyi, merenu anyi ihe anyi bu n'obi karia ka anyi nwere ike iyo. Anyi
bukwa umuaka: anyi ka na-asa ahu niafo. Ndi ibe anyi, biko nu, soro nu m taa
oji a taata, ka anyi niile tata ndu na ahu isi ike siite niike nke Chineke bu
Chukwu Abiama, Ikekaike, Olisa di ndu na-achi ofu Chi Ukwu uwatuwa
niile..<ISEEE>"....
.....MOE (Egbedaaovulu) .
'APPY NEW YEAR!!.
Ndi Igbo,
Biko nu
ka Onye obula na ndi ibe ya KUORO nu Dokita Ogochukwu Ene aka na
OGBUGBANDU nke a ocheputara n'afo Iri na Isii gara aga. Ngwanu...kpa,
kpa, kpa, kpa, kpa. Ugbu a ka m weere ohere a kpoturu umunne anyi kwesiri
itinye aka siite n'olu ha n'alu maka Iwelite Asusu na Omenala Igbo. Tupu
m'kpoturu ha biko ka m weere nu oji nkem n'ihi na asi na ogbU opi n'ezicha
imi.... Ndi Igbo bi na Clinton Kontry nke ka nke Prof. Dennis
Odionyenfe Balogu, Chima Otuechere, S.K. Orji, Dibia Chima Igwe, Jon
Agugbuem na Dibia Joe Onyilagha(Emesue Dike nke Ato na
Achina) ewetalam oji nke anyioo. UMU NNA!!, oji a Dokita Ene
paputara na Afo Iri na Isii gara aga erutela unu: Maazi
Abraham Anusiobi nwa Madu bi na Houston, oji ogbugbandu erutela nu-o. Ka anyi
pajekwara ya Chief Nnanna Agomuo(Obimba Ibeku) ka ometu ya aka. Chief Agomuo,
biko hukwa na Peter nwa De Opara meturu ya aka. Ana m aguta na okwu gina
ya n'adaba nke oma. Ka ebukwara ya bujere Dokita Chukwuemeka Uche na Ann
Abor Michigan ka ojiri okpurukpu okwu Igbo jaa ya nma. Anyi ejee
kpotukwara Eugene nwa Iwuamanam ka osoro tinye kwa aka ya. Alex Nkwerre Iheke
(Opiegbe), Onye Igbere bi na New Jersey, kedu maka "IGBO BASICS" ika
na edekwa ya?. Biko oji abaiala nu. Obu n'ezia na Omenala Igbo anaghi
ebunye Umu nwanyi oji ma na ha na-ata oji oburu ma awachaa ya. Ka m weree
nasi umu nne anyi nwanyi ndi a ka ha wekwara oji taa oburu na orute ebe ha
no: Chinwe Enemchukwu(Onye Uwa Oma) bi na Florida; Oka-Iwu Azuoma
Anugom, Adaejiagamba bi na California, Dokita Nkechinere Laetitia Uduma
bi na Michigan biko ahapukwala ita oji a. Achoghi m ichefu ufodu umu
nne anyi ndi m huru siite na njeghari m n'obodo a. Ka m malite na
Dallas: Nnaerika Okonkwo gi na Dokita Richard Nwachukwu unu onokwa ya ee? Oka-Iwu
Uzoma Maduka, ole kwanu, isokwa?: Oji erutala nu. Ezigbo nwanne Chief Sam
Nwankwo, Onye na-edu Ndi ICAN na Dallas/FW. Oji abiala nu. Oka-Iwu, Eddy
Nwokocha(Nwa Uturu), Johnson Ihemeremadu, Phillip Odoemena (Emperor), Dokita
Ihedinobi Acho Orabuchi, Geoffrey Nzeadibe unu n'okwa ya?: oji abiala
nu. Ka m jekwa Houston ozo je kpoturu Onye Oka- Iwu Kemnagum Okorie,
Ezekiel Nwakwue(Enyimba) na Dokita David Iloani. Ama m na
unu abanyela afo ohuu n'udo. 'Enyimba' aguru m akuko gi banyere
akwa(bridge) Umunwanwa nihi na abu m Onye ebe ahu. Tupu m mechie
maka na-ike agwuwala m ka m kpoturu Ndi Ngwa ndi ozo nke "Enyimba"
bu otu n'ime ha. Levi Nwasoria bi na Philadelpia, i nokwa ya eee?. Ikeoha,
Cyril Nwaguru bi na Michigan, asi na iwe ewere nwanne anaghi eru n'okpukpu
biko ka afo a buru afo gi na Nwanne anyi Charles Chikezie bi na New Jersey ga
enwe ike mata na unu bu otu umu nne, Ndi Ngwa. Nke ka nke unu wekwere oji
ogbugbandu a taa ooo!!. Kam nwe kwe ike kpoturu ndi a ka ha weree oji
taa, Ezii O. Chieke, Ezeana Achusim, Odera Igbo bi na China na Tony
Egbe(Obu Onye kwue nke bu ezi okwu anara Igwe ya?). Agaghi m
echefu umunne anyi nwoke ndi a bi na New Orleans, ha
topuru etopu, Nze Gibson Chigbu (Akaraka Nkwerre), Chief Godwin
Ndukwe na ndi ozo, oji abiala nu oooo. Dokita Okenwa Nwosu bi na
Washington D.C. na-edeputa Osondu Inc; ama m na ikwu chim chim, oji
abalia nu. Onwere onye ohuru ona anu oku n'obi na ihe gbasara
asusu Igbo. Aha ya bu Dokita Chidi N. Igwe na Mahadum nke Regina. Onye
isi, "Akuko na Oge Ndi Igbo" nke ina ewetara anyi amaka. Onye
ozo bu Dibia Izu Asiegbunam bikwa na Kanada biko werekwa oji Ndi Igbo taa
ma ADAkWALA MBA!!. Kedu kwanu maka Prince K.C. Asagwara bi na Kanada,
nwanna, iwe ewela gi na m jiri aha gi mechie, biko weree nu oji mee ka Ndi Igbo
obula bi ebe ahu soro na ogbugbandu a. N'ikpe azu, biko nu, ka anyi tuoro Umu
nne anyi Nwoke Abuo a nmanya ka Chukwu anyi n'akwere mkpru obi
ha na UDO SIITE NA OLU HA LURU IHU MAKA ODI NMA NDI IGBO tupu ha
ANWUO, UGO ANAKWENZE na CHIDI NWOSU.
Umu Igbo,
ogwula ka oha m n'onu. "ANURI AFO OHU OOO"! BANYE NU N'IME AFO
OHUU A N'UDO MA NWEE KWA OKWUKWE NA OGADICHA NMA!! . ISEEEEE.
Nnanta
Chidi. Uwadineke
Onye
Nduzi (Executive Director),
Otu
Iwelite Asusu na Omenala Igbo n'Obodo Amirika.
"Clinton
Kontri".
P.S.
Remember SOME PEOPLE MENTIONED ABOVE are no more with us till the END of 2013.
But it is good to KEEP this OGBUGBA NDU OJI going every year.