Ọjị Ọgbụgba-Ndụ nke afọ January 1st 2017.

40 views
Skip to first unread message

Abraham Madu

unread,
Dec 31, 2016, 6:29:59 PM12/31/16
to Chido Nwangwu, Zik Project, Nnanta Uwadineke, Ezeana Achusim, Baduba54, Ayo Ojutalayo, Amauche Ude, Ken Asagwara, okonkwo...@googlegroups.com, Kingsley Nnabuagha, SE. PE. Jerome Niang Yakubu, Stephen Uche, Nebukadineze Adiele, africanw...@googlegroups.com, Topcrest Topcrest, Ola Kassim, Igbo Basics, Joe Igbokwe, Okey Dike, Wharf Snake, Adeniran Adeboye, Chuhwuemeka Okala, Ozodi Osuji, Africa Today, OBSERVE YOURSELF, Igbo Radio, Festus Okere, ALUKO Mobolaji, abraha...@groups.facebook.com, Yahoo! Inc., Zubbie Ekwueme, G. Ukaegbu, Naija Observer, Roth Fash
 
Ọjị Ọgbụgba-Ndụ nke afọ January 1st 2017.
Maazị Nnanta Chidị Ụwadịneke na Maazị MOE Ene( Egbedaaovulu).
Afọ ọma rukwa mụ na gị na ụmụ Igbo nile aka ooo,HO! HA!
Ise eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee.
Onye wetara Ọjị wetara ndụ.
Ka anyị nile ta ya bụ Ọjị ka anyị were tata ndụ.
Ise eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Igwe ka ala bịa ta Ọjị ooo.
Eke bịa ta Ọjị ooo.
Orie bịa ta Ọjị oooo.
Afọ bịa ta Ọjị ooo.
Nkwọ bịa ta Ọjị ooo.
Ndụ mmir ndụ Azụ.
Ise eeeeeeeeeeeeeeee!
Ndụ Nwoke ,ndụ Nwanyị.
Ise eeeeeeeee.
Egbe bere Ugo bere nke sị na ibe ya ama ebe nku kwa ya na ike eeee.
Ise eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee.
Ka ngozi , ịhụnanya,udo, na ahụ isi ike bụrụ oke anyị nile na afọ ọhụa 2017!
Ise eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Cha cha cha Igbo kwenu!
YAA!
Cha cha Biafra kwenu!
YAA!
Cha cha cha Obodo Afrika nile kwezuenu!
YAAA!
Ya dịrị anyị nile na mma.
Ndị nile nọ na ụzọ ije chetanụ na Ndị Nna nnaanyị ha tụrụ ilu sị: Ọ bịara be onye abịagbula ya ka Ọ ga abụ Ọ law aka mkpukpu ghara ịpụ ya n’azụ.
Ghọtakwa nụ na ojemba enwe iro.
Ụmụ Igbo bụ Ojemba rukwa echi.
Were nụ obi ọma tinyere ụwa, maka na ejighị ike eso elu ụwa,HO! HA!
Ahụghị ka emere, eme ka afụrụ.
Ụwa dị egwu.
Ma ka osina dị, ka anyị ghara ịgbalarị Chi anyị na ọsọ.
Ndidi ka eji eso ụwa.
Onye nọ n’obodo onye ọzọ, ihe ga na eme ya ụbọchị nile iji na echetara ya na Ọ bụ ọbịa n’obodo ahụ.
Ka anyị gwa nụ onwe anyị Eziokwu maka na Eziokwu bụ ndụ,HO! HA!
Igbo/Biafra ga adị ooooooooo!
Ise eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṅụsịobi Madụ.
Ụra dị mkpa oooooo,HO! HA!
Ụra bụ ọgwụ ka ọgwụ,HO! HA!
Onye rahụrụ ụra abalị ọfụma, ka onye bara ụba na enweghị ike ịrahụ ụra.
Ọ dị ndị anaghị arahụ ụra ma ha aṅụghị ọgwụ.
Ndịa nwere oke nsogbu,HO! HA!
Ị me mmadụ ibe gị ihe ọjọ, Ị gaghị enwe ike hie ụra ọfụma ọfụma, maka na obi gị agaghị ezu ike.
Obi gị amaghị gị ikpe maka ihe ọjọ Ị mere mmadụ ibe gị, ọ ga arahụ ụra nke na ajụ ahụ oyi.
Nwata na agha Nne ya na Nna ya ahụ ka ha ghara ịrahụ ụra, gakwa agba onwe ya ụra,HO! HA!
Ma onye ukwu oooooo, ma onye nta oooooo, ga aghọ ndị ọlụ nche abalị,HO! HA!
Ejighị ike arahụ ụra.
Mgbe ụra na abịa aburu mmadụ, gị onwe gị anaghị ama, Nwanyị gị anaghị ama.
Ụra dị ka ọnwụ; kama ihe dị iche bụ na Ị ka na eku ụme ndụ.
Maka na onye nwụrụ anwụ anaghịzịkwa eku ume,HO! HA!
Wụọ mụ ihe nile, ma awụọla mụ ụra,cha cha!
Ụra ka ego ,HO! HA!
Onye arahụghị ụra abalị abụa na atọ, ara agba ya.
Ụra bụ ọgwụ ka ọgwụ na eme ka ahụ gị sie ike, mekwa ka ahụ dị gị gara gara mgbe chi foro iji ga enwe ike ịlụ ọlụ na ụbọchị ahụ.
Jisien nụ ike na eme ihe ga enyere ahụ gị aka ka ohie ụra ọfụma ọfụma.
Ndụ na alụ ọlụ abalị ga achọrịrị ụzọ hie ụra n’ehihie, ọbụghị otua ahụ, nsogbu ga adị.
Ha ga ada ọrịa.
Ezigbo akwa siri ike dị mma idina  ka ụra were tụa gị.
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṅụsịobi Madụ.
Ndi Igbo na Ndi Enyi Anyi,
 
Oburu na ina agu ihe a oputara na inoruela Afo Puku Abuo, Iri na Asaa (2017). Obara uru ka Ndi di NDU KELE CHUKWU UMU IGBO MERE KA ANYI DI NDU RUE AFO OHURU A obughi nihi na anyi kariri ndu nwuru anwu nma mana obu ka Chukwu si choo . Otutu ihe anyi na enweghi ike GBOCHIE emela. Ufodu anwuola nime afo garaga. Odighi ihe dika AFO GBARA AKA LAA. Ufodu na adoga ihu na ha na ezi na ulo ha ga adi ndu rue na-afo ozo. Chukwu Anyi ga anara EKPERE ONYE OBULA . Onye deputara 'OGBUGBA NDUA' bu Dokita Ogochukwu Ene na Afo, Puku, Nari Itolu, Iri Itolu na Asaa(1997). Oge ikpe azu m'ziputara ozi a bu na Afo Abuo gara aga, 2014. Ihe niile edere ebe a nadigide rue taa. Obu nezie               na Ufodu Ndi akpoturu n'oge ahu anwuola. Chukwu Anyi anakwerela  MKPURU OBI HA N'UDO.  Inwe kwara ike TINYE NKE GI. Ozi a rute gi, BIKO WEKWARA OJI  IGBO TAA nihi na inoruela Afo  OHUU ooooooo.
 
Nnanta Chidi. Uwadineke
Onye ihe oma gbasara Ndi Igbo, Ogan'ru na Asusu Anyi na anu oku n'obi.
Klinton-Kontri, Akinso U.S.A. 
 
 
 
Ndi Igbo na Ndi Enyi Anyi,
 
Unu aboola chi eee?. Unu anoruela afo ohuu, Puku Abuo, Iri na Ano (2014)?. Ka anyi nyenu Chukwu Abiama(Chukwu Obi Oma)  ekele puru iche.!!!  Onye deputara Ogbugba ndu oji a n'abali Mbu n'Onwa Mbu n'afo 1998 (1/1/98) bu Dokita Ogochukwu Ene bi na New Jersey n'oge ahu. Amaghim ma oka bikwa ebe ahu. Odi nma ka onye obula nwe ike guo ya, onwere ike oburu na okpoturu gi.  Emere m ka odi nfe imata ndi Dokita Ene kpoturu siite na ihylyte(highlight) aha ha. Oge odere ihe a, enweghi Igbo_forum ma obu ndi ozo. Ihe enwere mgbe ahu bu: mailto:igbo...@mcfeeley.cc.utex.edu. Amaghi m ma oka dikwa. Inwee ndidi gudarue ihe a ala, i ga ahu na onyere Ndi Igbo niile, Ndi Nwoke, Nwanyi, Umuaka, obula di ndi IRO Ndi Igbo EZIGBO NDUMODU.  Echere m na Ndi okpoturu oge ahu bu Ndi no na agba mbo Iwelite Asusu na Omenala Igbo ebe ha bi. N'ogwugwu, m'ga-akpoturu Ndi m'gecheta na agba mbo ugbua. Matakwa, ihe a bu okwu Dokita Ene site n'asusu Igbo ya. Odere si:
 
"NDI IGBO:
 
Kwenu
Kwenu m!!
Kwezuenu m!!!
 
Ekene m unu niile, kenekwe ihe na-emelu unu ihe. Afo ofuu oma! Oji abia! Ka anyi gbaanu ndu oji. [kolanut communion] Omenka Ejike, mgwa gosi umunna oji. Ogbagwojuru gi anya?. Mgwa soro akala anya nke m ga-enye gi paa oji. [controversies de!:))] O-o ya-o, a si na oji Eze di Eze n'aka? Daalunu. Aga m asu Igbo dika Omenka kuziri na Mahadum Uwandigbo. [All mistakes are mine; those not mentioned simply did not click as I shot you know-how!. I pre-apologize. Obialor Obiekwe can provide a decent Christian version: this one is "pop-Odinani" : [pseudo traditional Igbo creed]. Na mbu: ka anyi kelee ala Amerika, maka na ama erike n'obodo a. [Deities of this land, please permit us to pray in our language; I am sure you all understand. Thanks immensely]. Biko onye Cherokee ma obu onye mba ozo ndi nwe ala a,  weree oji akpa: maka oji luo ulo....
Ndi Enugwu, unu sokwe. Ndi Ebonyi, oji abia. Umunna  m n'Anambara, unu nokwa?. Ndi Ika, oshimiri Naija egbochine unu; leenu oji. Ndi ogo m, n'Imo, nkele wu ya-o! Oji Igbo! Ndi Abia, enyimba bu enyi Igbo! Ndi Ikwere, ma ndi bi na Diobu ma ndi bi na Ogbuo na Abali, oji abianu. Opobo, Ubani, ndi no na Akwa Ibom n'akwa Ogoja, unu sokwe. Ndi bi n'Ugwu Awusa, tulukwenu ugo. Ndi bi n'Odidanyanwu, "kosi wahala"---unu sokwe.
Anyi bu ndi bi n'Igbo Uzo[Igbo Diaspora] ekene m unu niile. Ifeanyi nwa Anyanwu na Japan, i ga-ebi. Afo ofuu i huru, anyiahula ya n'Amerika. Okaa Ufo Uzodike, Mandela na umunna anyi, ahu adikwa ha?. Maazi Uzo Okafor na Namibia, keleee Onyeishiala Sam Nujoma. Chuks Oguibe na London, i nokwa? Kelee ndi Bekee niile na-echere ndi Igbo uche oma. Maazi "Chill-ed"-- zekwere ndi awalaawala. Ndi Finland, ukpa ekene. Maazi Basil Ene, fulifulimmiri ["snow"] a na-adakwa? Ndi Russia, ndi Holland, ndi Germany, n'akwa ndi no na Obodo Oyibo, otito diri Chukwu.
Ndi Kanada, abia m. John Nwoke, ndi New Foundland ha na awa anya? biko hapu ihe edere n'ugboala bata n'ime. Fada Munachi, i ga-adi ndu wee kpuru okpu mme-mme na Vatican. anyi ga-enwe pope bu Onye Igbo. Uche gi odikwa ya!  Omenka, i nokwa? O"u m gaba na egwu adighi? Dike m ji eje mba, ekene diri gi. Chuks nwa Ezeun, Vancouver o ka dikwa na British Columbia? Hmmm! O dikwa "risky"!. Bosa, Ugo Nwokeji, o lee unu? Enyi m gbogboo, Tochai Omenuko, i kpakwa ahu? O nwere ihe anyi mere gi?. Biko puta n'ama ka anyi hu ogologo imi gi. Iyi na Mass. " and of the massess", abia m: o nwere onye na-acho gi uka? Si ya na MOE nokwa, na umu Biafra anaghi arahu ura. Enyi m gboo-gboo Maazi Nwuke, udo dikwara gi na Massachussets. Ndi Nu Yoku, NY, mmammanu. Onyeozizi Echeruo, i ga-adi. Ihe i na-emere ndi Igbo dikwa "imilimioso. " Ichie Cyber n'onwe ya, Okaa Obiora Taiwan Ozochiawaeze, o'u gini na-ese? Ndi "Ogbako Mba Uwa"[UNO] ha na-emekwere gi ihe oma? Chiji nwa Akoma, na-asupuru m Bekee. Nu Jesi, NJ kwekwenu! Anaeze Enigwe, ekenekwe m gi, kenekwe  ibve na -emere gi ibve. Nnewi 1, Okaa nwa Nwosu, i nokwa n'ala a? Okaa Ukobasi nwa Orji, o'u m patalu gi Schnapps? Zeribe, o'u ujo?  N'uwa nke a! Okaa Kalu Njoku na Yale, ishiewu o dikwa ebe ahu? Ukpa na okporoko anaghi aso m aso. Ndi Baltimore/DC/ Virginia, rienu!. Okaadibia Alex nwa Ukoh: onye oma m ji-eje ogu: biko kwuru m n'azu, buoro m uzo. Weree mma i ji-awa afo yie ha egwu:). Ogbuefwi nwa Odunukwe na Nnewi, i sokwa anyi? aka m dikwa ocha-o! Osineme: biko hapu ofee ndi ogo anyi bia ka anyi taa oji.  Bennet nwa Akpa, meghere m uzo n'ulo gi ohuu. Manny nwa Aniebonam n'Abagana, onye m ji eme onu: a na-eme eme....bia ka anyi mee n'oji. Kpotukwara ndi agbataobi gi maka na otu awughi n'ezihi!...i ma onye m na-ekwu maka ya :) Afam Agwu, ndii?. Eshi o dukwa? Laur Onyekwere n'Enugu, i ga-adi. Chris nwa Chukwu, birikwe o! Ka m kpotulu  Onyeozizi Okaa Olu Oguibe [OOOO] na Florida tupu m gawa Texas. Biko egbozine oge; puta ka anyi tuo gi aha. Texas: O'U GINI? Mag nwa Ekwueme, iyi egbunekwe gi. I ga-adi; gi na ndi be gi na ndi be anyi niile. Gregg nwa Ukaegbu, socrates n'ama Igbo, i na-ekpolikwe ndu? Taba ife  alu, ma agwachakwa "you know who," Ndi Mehico waa anya, kpotulu m n'egbughi oge ka anyi mee ha "many things." KDK na Austin Texas, i nokwa n'ala a? I ji ogwu?
Ndi Obodo William Clinton, o'u gini? Maazi Uwadineke, i sokwe? Maazi Ndubuisi Okere, bia tinye aka n'oji a. Kentucky abia m: Okpa Asoghi
Apiti, Okaa Akuma nwa Njoku: ekene m gi. Ama erike, ma ana m anu ihe i na-ekwu. Iowa, unu ka na-akokwa oka na Sioux City?. Okaa Enekwechi, mmamma o!. Jidekwe ka iji. Maazi Ayika na Umunne na Minnesota, ekenekwe m unu niile. Maazi Uzoma Chukwu, ndeewo enyi m. Maazi Uzo Onyemechi, nakwa echeki: ana m anu olu gi. Daalu-o!. Ndi obodo Lincoln, abia m: Okaa Kanayo Akujieze, tulukwe ugo. I ji ofo, o ji ofo ga-ala. Nwoke m Emeka Onumonu, biko na-abulu m abu bu sooso mma. I ga-adi. Ndi California, unu ana anya anwu ka ndi Pitakwa? Ugo Anakwenze, biko si ndi be anyi na-egwu adighi, na ako bu ije. Okaa Uzo Okoroanyanwu, o na-dabakwa "out there"? Onye a na-etu aha nwere ihe o na-eme.  Ndi nwe gi nwere mmadu.  A na-eme eme, a na-ekwu ekwu. I meele, Ndi Igbo ga na ekwu maka gi luo mgbe ebighebi. Onye si na o di "very easy," ya mee ka anyi kwuo!. Bikonu ka m kpotulu ndi enyi anyi: nwaanyioma Nkiru, biko bulu ukpa okoko "rose"[@>>>>>>--------Make a dozen pink, if you must!] JS, you are in the house. Snow, take a little bit of it across the River Niger, if you make it. If not, 1998 is another year. Ndi ilo anyi, udo diri unu ----for obvious reasons: ka unu haa anyi aka. Ndi osochiegbu, ndi m na-akpo "ndi ibo," anyi bu Ndi Igbo si unu chetekwe na ka eriri n'onu bu ka anyuru n'ike. Werenu ututu chowa ewu oji. "Why you lose your soul, you have really lost it." Ohere ka dikwara gi icheghari wee soro kpawa alo maka odinma ndi Igbo niile. Udo na ihunanya ka m ji bia; udo ka m ga-eji laa. Onye lua, ya rie; onye rie, ya n*uria. Ndi ibe anyi, ndu mmiri: ndu azu: odinala anyi: odinihu anyi: OGBUGBANDU OJI; omenala Igbo. OMENALA IGBO GA-ADI RUE MGBE EBIGHEBI!!!! . A mutala anyi n'uwa ka anyi mutakwa ndi ozo. Okorobia ndi na alubeghi nwunye, Chukwu biko nye ha umuada bu sooso ezi mma na ezi omume ha ga-alu. Ndi lutagoro nwunye, Chukwu biko nye ha nwa nke ahu, ishi na uche zulu oke. Onye muta, ya biko zua: anyi zuchaa umuaka anyi, ha azua anyi. Asi na ego amaka? Eyee, ego di nma inwe. Mana e jighi ike achu ego. Ihe  anyi cholu bia na obodo Amerika abughikwa oluoo, olu di n'ala Igbo: ego na ihe e ji enyere ndu aka ka anyi na-acho n'ala a. Onye chota ya were ego ahu meputa ezi ihe n'ebe o bi o niihi na ebe onye bi ka o na-awachi. Nyerenu umunne na umunna anyi aka; dozienu onwe unu nakwa ezi na ulo unu, maka na ezi na ulo ka Igbo ji biri. Onye mmadu nyeere aka, ya nyekwara  ndi ozo aka. Onye achokwala okwu. Nwa madu egbule nwa mmuo ma nwa mmuo egbune nwa mmadu. Nyerenu ndi inyom anyi aka ka ha na-azuputa umu anyi. Zekweelunu nso Ani. Ishi kotelu evu: evu gbaa ya. O kwa ile oma ka eju ji-aga niogwu, mana onye taa anyi aru niikeoma o zeghi nshi, anyi taa ya aru niishi anyi agaghi ezelu uvulu. Umuaka anyi ga-ege anyi nti.Anyi ga-ebi dika obodo si kwado. Umunna m, anyi na-elekwe anya ka-esi akpa nkata ndorondolo na obodo Naijiria. Ka anyi hapunu  o tulu nnu ma o tulu ose bulu uzo tinye ogiri n'ofe ka o wee too uto. Anyi racha ofe ahu, n*uo mmanya, anyi ewere gbaa izu, izu umunna. O teele aka ndi Igbo ji-acho ka ha na ndi agbataobi anyi nwee nghota toluato. Anyi agaghi ekwe ka ndi mkpasa na ndi nlafu duba anyi niime onwunwa. Onye ji ofo ga-ala: anyi ji ofo. O nweghi ihe anyi  mere megide  mmadu. Otutu okwu adighi mma na uka mgbede, ma agwachakwaa ndi uka Katoliki . Anyi ga-ebi nu. Afo nke a bu 2011 ga-ami mkpuru ga-abara anyi uru. Ka anyi were ihe gbasara odinma anyi tinye niaka Chineke. Chukwu Abiama, ka O dube ndi niile na-agba mbo MAKA OGANIRU NDI IGBO. Ndi Ichie, biko bianu taa oji. Mmuo ndi anyi ma, na ndi anyi amaghi, mmuo niile na-emere anyi ihe oma, bianu taa oji. Alusi na mmuo niile di na Enugwu na Ebonyi: bianu taa oji. Alusi Anambara n'akwa mmuo ha niile: bianu taa oji. Nke ndi Imo na ndi Abia, na mpaghara Mba Mmiri bu be ndi Igbo, bikonu oji abiala-oo!. Alusi na mmuo ndi Mmu Ika, biko, Oshimiri Naija egbochikwene unu: gbatanu bia soro anyi mee mmemme oji a, soro anyi rie oriri oji a nke anyi ga-esi na ya rita ndu. Unu zuko, bikonu chebenu umu Igbo niile na ndi enyi ha bi n'uwa nke a anyi bi niime ya; duzienu anyi, merenu anyi ihe anyi bu n'obi karia ka anyi nwere ike iyo. Anyi bukwa umuaka: anyi ka na-asa ahu niafo. Ndi ibe anyi, biko nu, soro nu m taa oji a taata, ka anyi niile tata ndu na ahu isi ike siite niike nke Chineke bu Chukwu Abiama, Ikekaike, Olisa di ndu na-achi ofu Chi Ukwu uwatuwa niile..<ISEEE>"....
                                                .....MOE (Egbedaaovulu) .
                                                'APPY NEW YEAR!!.
Ndi Igbo,
 
Biko nu ka Onye obula na ndi ibe ya KUORO nu Dokita Ogochukwu Ene aka na OGBUGBANDU nke a ocheputara n'afo Iri na Isii gara aga. Ngwanu...kpa, kpa, kpa, kpa, kpa. Ugbu a ka m weere ohere a kpoturu umunne anyi kwesiri itinye  aka siite n'olu ha n'alu maka Iwelite Asusu na Omenala Igbo. Tupu m'kpoturu ha biko ka m weere nu oji nkem n'ihi na asi na ogbU opi n'ezicha imi.... Ndi Igbo bi na Clinton Kontry nke ka nke Prof. Dennis Odionyenfe Balogu, Chima Otuechere, S.K. Orji, Dibia Chima Igwe, Jon Agugbuem na Dibia Joe Onyilagha(Emesue Dike nke Ato na Achina) ewetalam oji nke anyioo. UMU NNA!!, oji a Dokita Ene paputara na Afo Iri na Isii  gara aga erutela unu: Maazi Abraham Anusiobi nwa Madu bi na Houston, oji ogbugbandu erutela nu-o. Ka anyi pajekwara ya Chief Nnanna Agomuo(Obimba Ibeku) ka ometu ya aka. Chief Agomuo, biko hukwa na Peter nwa De Opara meturu ya aka. Ana m aguta na okwu gina ya n'adaba nke oma. Ka ebukwara ya bujere Dokita Chukwuemeka Uche na Ann Abor Michigan ka ojiri okpurukpu okwu Igbo jaa ya nma. Anyi ejee kpotukwara Eugene nwa Iwuamanam ka osoro tinye kwa aka ya. Alex Nkwerre Iheke (Opiegbe), Onye Igbere bi na New Jersey, kedu maka "IGBO BASICS" ika na edekwa ya?. Biko oji abaiala nu. Obu n'ezia na Omenala Igbo anaghi ebunye Umu nwanyi oji ma na ha na-ata oji oburu ma awachaa ya. Ka m weree nasi umu nne anyi nwanyi ndi a ka ha wekwara oji taa oburu na orute ebe ha no: Chinwe Enemchukwu(Onye Uwa Oma) bi na Florida; Oka-Iwu Azuoma Anugom, Adaejiagamba bi na California, Dokita Nkechinere Laetitia Uduma bi na Michigan biko ahapukwala ita oji a. Achoghi m ichefu ufodu umu nne anyi ndi m huru  siite na njeghari m n'obodo a. Ka m malite na Dallas: Nnaerika Okonkwo gi na Dokita Richard Nwachukwu unu onokwa ya ee? Oka-Iwu Uzoma Maduka, ole kwanu, isokwa?: Oji erutala nu. Ezigbo nwanne Chief Sam Nwankwo, Onye na-edu Ndi ICAN na Dallas/FW. Oji abiala nu. Oka-Iwu, Eddy Nwokocha(Nwa Uturu), Johnson Ihemeremadu, Phillip Odoemena (Emperor), Dokita Ihedinobi Acho Orabuchi, Geoffrey Nzeadibe unu n'okwa ya?: oji abiala nu. Ka m jekwa Houston ozo je kpoturu Onye Oka- Iwu  Kemnagum Okorie, Ezekiel Nwakwue(Enyimba) na Dokita David Iloani. Ama m na unu abanyela afo ohuu n'udo. 'Enyimba' aguru m akuko gi banyere akwa(bridge) Umunwanwa  nihi na abu m Onye ebe ahu. Tupu m mechie maka na-ike agwuwala m ka m kpoturu Ndi Ngwa ndi ozo nke "Enyimba" bu otu n'ime ha. Levi Nwasoria bi na Philadelpia, i nokwa ya eee?.  Ikeoha, Cyril Nwaguru bi na Michigan, asi na iwe ewere nwanne anaghi eru n'okpukpu biko ka afo a buru afo gi na Nwanne anyi Charles Chikezie bi na New Jersey ga enwe ike mata na unu bu otu umu nne, Ndi Ngwa. Nke ka nke unu wekwere oji ogbugbandu a taa ooo!!. Kam nwe kwe ike kpoturu ndi a ka ha weree oji taa, Ezii O. Chieke, Ezeana Achusim, Odera Igbo bi na China  na Tony Egbe(Obu Onye kwue nke bu ezi okwu anara Igwe ya?).    Agaghi m echefu umunne anyi nwoke ndi a bi na New Orleans, ha  topuru etopu, Nze Gibson Chigbu (Akaraka Nkwerre), Chief Godwin Ndukwe  na ndi ozo, oji abiala nu oooo. Dokita Okenwa Nwosu bi na Washington D.C. na-edeputa Osondu Inc; ama m na ikwu chim chim, oji abalia nu. Onwere onye ohuru  ona anu oku n'obi na ihe gbasara asusu Igbo. Aha ya bu Dokita Chidi N. Igwe na Mahadum nke Regina. Onye isi, "Akuko na Oge Ndi Igbo" nke  ina ewetara anyi amaka. Onye ozo bu Dibia Izu Asiegbunam bikwa na Kanada biko werekwa oji Ndi Igbo taa ma ADAkWALA MBA!!. Kedu kwanu maka Prince K.C. Asagwara bi na Kanada, nwanna, iwe ewela gi na m jiri aha gi mechie, biko weree nu oji mee ka Ndi Igbo obula bi ebe ahu soro na ogbugbandu a. N'ikpe azu, biko nu, ka anyi tuoro Umu nne anyi Nwoke Abuo a nmanya ka Chukwu anyi n'akwere mkpru obi ha na UDO SIITE NA OLU HA LURU IHU  MAKA ODI NMA NDI IGBO tupu ha ANWUO, UGO ANAKWENZE na CHIDI NWOSU.
Umu Igbo, ogwula ka oha m n'onu. "ANURI AFO OHU OOO"! BANYE NU N'IME AFO OHUU A N'UDO MA NWEE KWA OKWUKWE NA OGADICHA NMA!! . ISEEEEE.
 
Nnanta Chidi. Uwadineke
Onye Nduzi (Executive Director), 
Otu Iwelite Asusu na Omenala Igbo n'Obodo Amirika. 
"Clinton Kontri".
 
 P.S. Remember SOME PEOPLE MENTIONED ABOVE are no more with us till the END of 2013. But it is good to KEEP this OGBUGBA NDU OJI going every year.
 
 
 
Reply all
Reply to author
Forward
0 new messages