Ije!
Ị ka nka, Ị ghọta ije.
Gịnị bụ ije ana akọwa ebea?
Ịka nka bu ahụ mgbu abịa.
Ọrịa dị iche iche.
Anya egbughị gị, ikpere ana egbu gị, eze egbughị gị, ukwu ana egbu gị.
Ntị mgbu nkọ?
Obi mgbu kwanụ?
Ọbara mgbali elu kwanụ?
Igbo mụrụ Nze, mụọ Ọzọ, tụrụ ilu sị: Na Agadi Nwanyị anaghị aka nka na egwu Ọ mara agba mgbe Ọ dị na agbọghọ ọbịa,O jizị nga nga egbe ya.
Ana ejide ya aka.
Ọ nakwa ejide mkpara ya aka ike ,ka Ọ ghara ịda gbajie ụkwụ, ukwu, ọkpa, ma ọbụ kụọ isi n’ala.
Ka anyị were obi ume ala were soro nka.
AmaraChukwu dube anyị na ije nka!
Ise eeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeeee!
Ntị ọdị kwa?
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṇụsịobi Madụ.