Ọgwụ.
Ana agwụọ, ọna ere!
Gịnị bụ ọgwụ?
Mkpa ahịhịa bụ ọgwụ.
Mgbọrọgwụ bụ ọgwụ.
Dogonyaro bụ ọgwụ ịba, gbam!
Akwụkwọ aṇara bụ ọgwụ.
Mkpụrụ ọjị bụ ọgwụ.
Akịlu bụ ọgwụ.
Mkpụrụ akwụ bụ ọgwụ.
Ehure bụ ọgwụ ụmụ nwanyị mụrụ nwa ọhụrụ.
Ụgbọghịrị.
Anyụ.
Ọkwụrụ.
Ube.
Ụkwa.
Ogiri bụ ọgwụ.
Akpaka/ụkpaka bụ ọgwụ.
Olugbo bụ ọgwụ.
Ụgụ bụ ọgwụ.
Mkpụrụ ụgụ bụ ọgwụ.
Ose bụ ọgwụ.
Mkpụrụ agbara bụ ọgwụ.
Mkpụrụ arụrọ bụ ọgwụ.
Nmịmị bụ ọgwụ.
Ụdara bụ ọgwụ.
Pọpọ bụ ọgwụ.
Akịbeke bụ ọgwụ.
Mmiri akị bụ ọgwụ.
Unere bụ ọgwụ.
Ujiri /oroma bụ ọkwụ.
Mango bụ ọgwụ.
Kasu bụ ọgwụ.
Aga mụ akọ ole ghara ole?
Mkpụrụ osisi nile, akwụkwọ osisi nile, azụ osisi nile/ụgbụgbọrọ osisi nile, akwara/mgbọrọgwụ osisi nile bụ ọgwụ dị iri dị ndụ.
Chọkụ/Chalk abụghị ọgwụ, cha cha.
Chọkụ/Chalk bụ oke rie Ọ nwụọ.
Ọbụ ka ọha mụ n’olu.
Onye nwere ntị ya nụrụ ozi ọma Chineke.
Oziọma na enye ndụ tata, echi,na nwanne echi.
Awara awara!
Ọna aṇụ ọgwụ.
Akọrọ ya ọgwụ.
Ana agba ọgwụ.
Ịgba ọgwụ, ịnụ ọgwụ, na ịkọ ọgwụ abụghị ihe anyị chọrọ na ndụ anyị,HO! HA!
Ntị ọdị kwa?
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṇụsịobi Madụ.