Nwoke na anya nwanyị ya ka akpa!
Nwanyị bụ akpa dị arụ.
Nna na anyara adanya nwanyị nyanye Di ga alụ ya n’aka.
Nwanyị bụ oke agwụ, ejighi ofu aka apay a.
Di nwanyị nwụọ, ụmụ ya ekobe nne ha ka akpa.
Nkea mere nwanyị ji ebi ogologo ndụ, kara Di lụrụ ya.
Nwanyị bụ oriokụ bụrụ kwa ọkpata akụ.
Ọkpata na eri akụ aracha ọnụ, akata ụka ịlụ nwanyị Ọ wara ọsị, dị iche.
Ọkpata na eri akụ aracha ọnụ, akata ụka ịlụ nwanyị O kporo ọsọ , achọghị nsogbu so ịlụ nwanyị abịa.
Ịlụ nwanyị bụ ọlụ.
Ịlụ nwanyị dị ka ozu nwa beke, iburu ya ga n’iru, mba!
Ị buru ya laba azụ ,mba!
Ọdịghị etu esi me ya mete yam ma!
Agaghị ekwuo mgbagbu were ghara ije agha.
Esoro makai he dị Awala n’ime afọ, asọ Awala oyi.
Agaghị ekwuo mgbagbu were ghara ije ọgụ.
Ofu ihe ga egburịrị nwoke.
Ntị ọdị kwa?
Ya kpọtụba!
Ya gazie.
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṇụsịobi Madụ.